Free cookie consent management tool by TermsFeed
ISTSS Logo ISTSS Logo
 
Home > AM24 > ISTSS 40th Annual Meeting > Ọgbakọ ISTSS nke afọ iri anọ ya

Ọgbakọ ISTSS nke afọ iri anọ ya

Site n’ogo nke oche oria, ruo n’àkwà ma gabiga: ịkwalite agamnihu sayens ntụgharị n’ebe ọmụmụ oke nchegbu na-eso ọdachị dị.

Septemba 25-28, 2024
Boston Marriott Copley Place
Boston, Massachusetts, USA

Ọgbakọ nke ISTSS na-enwe kwa afọ na-ewepụta ohere maka mgbasa ozi si n’ọrụ atụtụ, ọrụ nchọcha sayensị nakwa usoro doro anya a na-ahụ n’ọmụmụ ọrịa nke oke nchegbu na-eso ọdachi. Ọgbakọ a a na-enwe kwa afọ ọbụla na-agụnyekwa ọrụ nke ebumnobi ya bụ ịgbasa ozi banyere iwu emere maka ọha obodo. N’ime ọgbakọ a, ndị ọkachamara na ndị isi ọrụ a gbasara na-arụpụta ma na-akwalite ezi mmekọrịta pụrụ iche, iji mee ka agamnihu dị na mpaghara ọmụmụ ọrịa oke nchegbu a. Ọ bụ ọgbakọ ọtụtụ ndị si na mba ofesi nakwa mpaghara amụmamụ ụfọdụ na-abịa, dị ka ndị na-ahụ maka ndị isi mgbaka, ndị ọkachamara n’amụmamụ ụbụrụ mmadụ, ndị na-arụ ọrụ ọha obodo, ndị nọọsụ, ndị kasnilọ, ndị nchọcha, ndị na-ahazi ọrụ, ndị na-ekwuchitere mmadụ ọnụ, ndị nta akụkọ, ndị ụkọ Chukwu nakwa ndị ọzọ nwere mmasị n’amụmamụ na agwọmọrịa ndị nwere ọrịa oke nchegbu.

Ọtụtụ ndị mmadụ n'ụwa na-agabiga ọdachi na oke nchegbu, tụmadi ọgbaghara, agha, ihe ike, ịkpa oke agbụrụ mmadụ si, nakwa akụkọ mmegbu ndị ọzọ juru n'obodo. Nsogbu ndị a na-ebute mmekpa ahụ n'ọnọdụ ahụike mmadụ dị ka ihe gbasara echemeche mmadụ, mmegharị ahụ nakwa ọdịdị ahụ mmadụ. Agbanyeghị na e meela ọtụtụ nchọcha maka ịkwalite agamnihu nke amụmamụ ọrịa oke nchegbu, mana oge ehiwere iji gbasaa ozi ndị kwesịrị maka ya nakwa itinye nchọpụta emere n'ọrụ na-abanwanye karịa ka e si hazie ya, nke a na-ebute ndọghachi azụ na mmepụta ọrụ nke ndị ọkachamara sayensị, ka o si kwesi ịdị. E nwere nnyocha e kwesịrị ime banyere ịtụgharị ihe achọpụtara na nchọcha ndị sitere na lab ruo n'itinye ya n'ọrụ ka ọ gazuo ụwa niile. Ya mere, e kwesịrị ịga n'ihu ime mkparịtaụka gbasara nchọcha ọhụrụ, usoro ọgwụgwọ, nakwa iwu ndị na-arụ aka ma na-ejikọtakwa atụtụ banyere ọrịa oke nchegbu, tụmadị ntọala sayensị, nchọcha na-anwale ihe, nghọta na mmejupụta ihe, iji kwalite agamnihu nke nchọcha dị n'ọrịa nke oke nchegbu.

Ọgbakọ a, nke bụ nke afọ iri anọ ya, ga-elebakwa anya n'atụmatụ ọhụrụ eji etinye amamiihe ntọala sayensi n'ọrụ n'ebe nnyocha na ọgwụgwọ nke ọrịa oke nchegbu dị, tụmadị na ntụgharị nchọpụta sayensi e merela dịkwa, ka ha bụrụ ihe enyemaka pụtara ihe nye ụwa niile. Iji mezuo ebumnobi a, anyi na-anabata nchọcha ndị gbadoro ụkwụ n'ọrịa oke nchegbu nke isiokwu ha metụtara mana ọ kpaghị oke na mpaghara ndị a:

  • Itinye nchọpụta ndị sayensị biomedikal n’ọrụ iji gbazie ụzọ na nnyocha na enyemakaa a na-enye maka ihe ngosi ọrịa oke nchegbu.
  • Ime nchọcha gbasara ọnọdụ ụbụrụ, ahụ, gburugburu na usoro akparamagwa mmadụ nke na-agbado ụkwụ ka onye rịara ụdị ọrịa ahụ si eme.
  • Nchọcha nke hiwere isi ịkọwa ka nchọcha sayensị si dị gbasara ntụgharị.
  • Ọtụtụ ihe omume ndị akwadoro nakwa nchọcha ọhụrụ emere n’ebe ntọala sayensi, enyemaka na mmeputa ọrụ, nakwa iwu dị.
  • Inyocha ka ụzọ ọgwụgwọ ọrịa ọhụrụ ga-esi enye aka ịkọwa ihe ndị na-esi n’ọrịa oke nchegbu a apụta.
  • Ileba anya n’usoro nchọcha ndị bụ ịgba nakwa ndị nwere ezigbo mgbado ụkwụ  n’ebe nchọcha sayensị ntụgharị dị.
  • Inyocha mpụtara ụkpụrụ ụfọdụ na ihe ndị ọzọ metụtara ntinye nke nchọcha sayensị ntụgharị na-ewebata n’ebe ihe ọmụmụ ọrịa oke nchegbu dị. 
  • Inyocha ụzọ ndị kacha mma a pụrụ iji gbasaa ozi nchọcha a nke ọma ka ndị isi dị iche iche nwere mmasị n’isiokwu a mara maka ya.
  • Inyocha ụzọ ndị ka mma iwebata mmekọrita n’etiti sayensị ntụgharị nakwa ngalaba amụmamụ ndị ọzọ.
  • Nnyocha na-ekwu maka nhịahụ na arụmụka ndị gbasara sayensị ntụgharị.
  • Inyocha sayensị ntụgharị dị ka o si gbasa ụwa niile.
N'ụzọ sara mbara, ebumnobi ọgbakọ a ka o si metụta sayensị bụ ikpuchi oghere dị n'etiti oche ọrịa, àkwà ọrịa nakwa mmepụta ndị dị n'ọmụmụ sayensị nke ọrịa oke nchegbu. Nke kachasi nke, ebumnobi ọgbakọ a bụ ibelata ibu dị n’ọnọdụ ahụike nakwa akụ nke ọha obodo n’ebe ihe ndị na-egosi ọrịa oke nchegbu dị, iji nyere ụwa aka ma butekwa agamnihu nye ndị na-arịa ọrịa a, nke ọzọ bụkwa ịkwalite nghọta na usoro mgbake nke ndị na-arịa ọrịa oke nchegbu, tụmadị ka ndị obodo ga-esi kwụrụ chịm n’agha ha na-ebu imegide ọrịa oke nchegbu. Ị ga-amụta etu esi eme ihe ndị a:
  • Ịkpa nkata maka isiokwu ndị gbadoro ụkwụ na ntọala na usoro nke sayensị ntụgharị ka o si metụta amụmamụ ọrịa oke nchegbu n’ụwa niile.
  • Igosi nghọta zuru oke gbasara ọkpụrụkpụ nsogbu na nhịahụ ahụtara n’ịtụgharị mpụtara nchọcha ndị e mere site n’ogo oche ọrịa ruo n’ogo àkwà.
  • Ịmepụta na itinye n’ọrụ usoro na emume ndị anwapụtara kacha mma, ma webata nchọcha sayensị e merela n’ọrụ ịgwọ ndị mmadụ ọrịa.
  • Wepụta ọsịsa ọhụrụ iji mechie oghere dị n’etiti nchọpụta sayensị, ọrụ ụlọ ọgwụ, mmepụta iwu nakwa atụmatụ maka ahụike ọha.